قُلْتُ لَمَّا غَابَ عَنِّي
Asịrị m, Mgbe ọ pụrụ m n'anya
Ig
قُلْتُ لَمَّا غَابَ عَنِّي
نُورُ مَرَاكَ الْمَصُون
Asịrị m, mgbe ìhè ịma mma gị e nchekwara
funahụrụ m ma zoo m n'anya,
شَفَّنِي وَاللَّهِ سُقْمٌ
فِيهِ قَدْ ذُقْتُ الْمَنُونَ
N'aha Chineke, otu ọrịa emela m ezigbo ike
nke m detụrụ ọnwụ n'onwe ya ire n'ime ya
وَعُيُونِي مِنْ نَحِيبٍ
جَارِيَاتٌ كَالْعُيُون
Anya m, site n'akwa arịrị dị ilu
na-erubiga ókè dị ka iyi na-agba agba
وَجُفُونِي مَا كَفَاهَا
مَا جَرَى حَتَّى جَفُون
Akpụkpọ anya m ejughị afọ n'anya mmiri niile gbara
ruo mgbe ha onwe ha kporo nkụ
هَامَ قَلْبِي زَادَ وَجْدِي
فَمَتَى وَصْلَكْ يَكُونُ
Obi m na-awagharị n'ịhụnanya, agụụ m na-eto
oleezi mgbe nzukọ anyị ga-abụ?
غَابَ عَنْ عَيْنِي ضِيَاهَا
يَا قَمَرَ دَارِي الْعُيُون
Ìhè ahụ efuola n'ihu m
Ewoo Ọnwa mara mma, wetara anya ndị a nkasi obi